isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?

2. Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a.

3. Ma ub͕u a gini di n'okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n'aka, ma-ọbu ihe agāchọta.

4. Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n'okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru.

5. Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N'ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n'imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m'nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta?

6. Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.

7. Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.

8. Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.

9. Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.

10. Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.

11. Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si,Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

12. Devid we tiye okwu ndia n'obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.

13. O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya.

14. Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n'ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?

15. Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n'irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n'ulom?