isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 25 Bible Nso (IGBOB)

1. Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.

2. Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n'ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel.

3. Ma aha nwoke ahu bu Nebal; aha nwunye-ya bu Abigail: nwayi ahu nwere ezi uche, ma kwa nma n'aru: ma nwoke ahu siri ike n'obi, jọ kwa njọ n'omume nile; ya onwe-ya bu kwa onye Keleb.

4. Devid we nu n'ọzara na Nebal nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

5. Devid we ziga umu-okorọbia iri, Devid we si umu-okorọbia ahu, Rigoruenu Kamel, bakuru Nebal, jua ya ajuju bayere udo-ya n'aham,

6. si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa.

7. Ma ub͕u a anuwom na i nwere ndi nākpacha aji anu: ub͕u a ayi na ndi-ọzùzù-aturu i nwere anọwo, ayi emeghi ka ihere me ha, ọ dighi kwa ihe ọ bula ha lere anya ya na o furu efu, ubọchi nile ha nọ na Kamel.

8. Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n'iru gi; n'ihi na ọ bu n'ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta.

9. Umu-okorọbia Devid we bata, gwa Nebal okwu n'aha Devid dika okwu ndia nile si di, we nọdu du.

10. Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n'aka onye-nwe-ya.

11. M'gēwere kwa achicham na mirim na anum eb͕uru eb͕u nke m'b͕uworo bayere ndim nākpacha aji anu, nye ndikom ndi m'nāmaghi ebe ha si bia?

12. Umu-okorọbia Devid we chigharia n'uzọ-ha, lata, bia gosi ya dika okwu ndia nile si di.

13. Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n'úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n'úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n'úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n'azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n'ebe ihe-ha di.

14. Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n'ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha.

15. Ma ndikom ahu di nma nke-uku ka ha si me ayi, emeghi kwa ka ihere me ayi, ọ dighi kwa ihe ọ bula ayi lere anya ya na o furu efu n'ubọchi nile ayi na ha nējeghari, mb͕e ayi nọ n'ọhia:

16. ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu.

17. Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.

18. Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.

19. Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n'irum; le, m'nābia n'azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal.

20. O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n'ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha.

21. Ma Devid siri, Nání n'efu ka m'debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n'ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n'ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe.

22. Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere.

23. Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.

24. O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.

25. Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.

26. Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.

27. Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.

28. Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.

29. Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.

30. O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;

31. na nka agaghi-aburu gi ihe-nṅaghari, ọ gaghi-aburu kwa onye-nwem ihe-isu-ngọngọ obi, na i wusiwo ọbara n'efu, ma-ọbu na onye-nwem azọputawo onwe-ya: ma mb͕e Jehova gēmewori onye-nwem nma, i gēcheta kwa orù-gi nwayi.

32. Devid we si Abigail, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye zitere gi ta izutem:

33. ihe agọziri agọzi ka ezi uche-gi bu kwa, onye agọziri agọzi ka i bu kwa, onye b͕ochiworom ta ka m'ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka akam ghara kwa izọputam.

34. Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m'ghara imejọ gi, n'ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu.

35. Devid we nara n'aka-ya ihe o wetara ya: ọ si ya, Rigorue ulo-gi n'udo; le, egewom nti olu-gi, hu kwa gi iru-ọma.

36. Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.

37. O rue, n'ututu, mb͕e manya-vine puworo n'anya Nebal, na nwunye-ya gosiri ya okwu ndia, obi-ya we nwua n'etiti ya, ya onwe-ya we di ka nkume.

38. O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gabigara, na Jehova tib͕uru Nebal, o we nwua.

39. Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n'ikpé, me ka m'pua n'aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n'isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n'onwe-ya na nwunye.

40. Ndi-orù Devid we biakute Abigail rue Kamel, gwa ya okwu, si, Devid ezitewo ayi biakute gi ilutara ya gi onwe-gi na nwunye.

41. O we bilie, kpọ isi ala, kpue iru-ya n'ala, si, Le, orù-gi nwayi bu nwayi nēje ozi isa ukwu ndi-orù onye-nwem.

42. Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n'inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n'ukwu n'ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n'azu, ghọrọ ya nwunye.

43. Devid kuru-kwa-ra Ahinoam nke Jezreel; ha we ghọrọ ya nwunye, ọbuná ha abua.

44. Ma Sọl were Maikal nwa-ya, bú nwunye Devid, nye Palti nwa-nwoke Laish, onye sitere na Galim.