Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 24:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si,Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,

3. ayi nānara ya nke-ọma n'uzọ nile na n'ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile.

4. Ma, ka m'ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n'ọnu-ayi.

5. N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:

6. onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 24