1. Mb͕e ubọchi ise gasiri onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we ridata, ya na ndi-okenye ufọdu, na otù onye-ọ̀kà-okwu, aha-ya bu Tatọlọs; ndi ahu we kọrọ onye-isi akukọ megide Pọl.
2. Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si,Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,
3. ayi nānara ya nke-ọma n'uzọ nile na n'ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile.
4. Ma, ka m'ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n'ọnu-ayi.
5. N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:
6. onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra:
7. Ma onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, biakwasiri ayi, we were aka ike naputa ya n'aka-ayi;
8. onye i gāpu imazu n'ọnu-ya okwu bayere ihe nile ndia, nke ayi onwe-ayi nēbo ya ebubo, mb͕e gi onwe-gi gēkpe ya ikpé.