Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 2:36-46 Bible Nso (IGBOB)

36. Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.

37. Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?

38. Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.

39. N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya.

40. O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ.

41. Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.

42. Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.

43. Madu nile we tua egwu n'otù n'otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n'aka ndi-ozi.

44. Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile;

45. ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula.

46. Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 2