Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 2:17-25 Bible Nso (IGBOB)

17. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.

18. Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:

19. Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu.

20. Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.

21. Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n'ikwa-iko-ya.

22. Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya.

23. M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.

24. Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.

25. Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 2