isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n'Efesọs akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n'aka-nri-Ya, Onye nējeghari n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me:

2. Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha;

3. i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n'ihi aham, ike akāgwughi kwa gi.

4. Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n'anya ahu i nwere na mbu.

5. Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.

6. Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.

7. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.

8. Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu:

9. Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.

10. Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.

11. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n'ọnwu nke-abua ahu.

12. Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si,Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua:

13. Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi.

14. Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.

15. Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu.

16. Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M'gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha.

17. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.

18. Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:

19. Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu.

20. Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.

21. Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n'ikwa-iko-ya.

22. Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya.

23. M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.

24. Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.

25. Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia.

26. Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M'gēnye kwa ike ichi mba nile:

27. ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:

28. M'gēnye kwa ya kpakpando ututu.

29. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.