Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 14:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus.

13. M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.

14. M'we hu, ma le, ígwé ọcha; n'elu ígwé ọcha ahu ka m'huru otù Onye yiri nwa nke madu ka Ọ nānọdu ala, nēkpu okpu-eze nke ọla-edo n'isi-Ya, mma-iwe-ihe-ubi di nkọ di kwa n'aka-Ya.

15. Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n'ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n'ihi na ihe agēwe n'ubi nke uwa achabigawo ókè.

16. Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu we tudà mma-iwe-ihe-ubi-Ya n'elu uwa; ewe were uwa dika ihe-ubi.

17. Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu nke di n'elu-igwe puta, ya onwe-ya nwe-kwa-ra mma-iwe-ihe-ubi di nkọ.

18. Mọ-ozi ọzọ we si n'ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n'ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n'ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 14