Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 13:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.

10. Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.

11. M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.

12. O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.

13. ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.

14. O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.

15. Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.

16. Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha;

17. ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 13