Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 10:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa:

9. na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí:

10. n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.

11. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya.

12. N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya:

13. n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

14. Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi?

15. ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!

16. Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?

17. Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.

18. Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie,N'uwa nile ka olu-ha puru jezue,Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 10