Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9:15-33 Bible Nso (IGBOB)

15. Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu.

16. Ọ dighi kwa onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu tukwasi n'uwe ochie; n'ihi na nke kwesiri ímechi ya nādọkapu ihe n'aru uwe ahu, ndọka jọkariri njọ aputa.

17. Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.

18. Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu.

19. Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra.

20. Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka:

21. n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

22. Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.

23. Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,

24. Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n'ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì.

25. Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n'aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie.

26. Ùdé a we pua gazue n'ala ahu dum.

27. Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid.

28. Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi.

29. Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.

30. Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.

31. Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.

32. Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.

33. Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 9