Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 23:24-36 Bible Nso (IGBOB)

24. Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel.

25. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu.

26. Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha.

27. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile.

28. Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n'ìhè dika ndi ezi omume, ma n'ime unu juputara n'iru-abua na ihe nēmebi iwu.

29. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume,

30. unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma.

31. Ya mere unu nāb͕a àmà megide onwe-unu, na unu bu umu nke ndi b͕uru ndi-amuma.

32. Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà.

33. Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ?

34. N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:

35. ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu.

36. N'ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 23