Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 2:7-19 Bible Nso (IGBOB)

7. Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè.

8. O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya.

9. Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ.

10. Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku.

11. Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.

12. Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.

13. Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì.

14. O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt;

15. O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam.

16. Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.

17. Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si,

18. Anuru olu na Rema,Ikwa-ákwá na iru-újú uku,Rechel nākwara umu-ya ákwá;Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n'ihi na ha adighi.

19. Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n'Ijipt,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 2