Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 12:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya:

2. Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n'aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n'agha ahu agānọchigide Jerusalem.

3. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.

4. N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M'gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M'gēji ikpu-ìsì tib͕ue.

5. Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n'obi-ha, Ume m'nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha.

6. N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 12