Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 26:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.

2. Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile gēnwe.

3. Ákwà-nkwuba ise ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya; ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya.

4. I gēji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu; otú a ka i gēme kwa n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

5. Ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme kwa nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua; anya-nko gēcherita onwe-ha iru, otù na ibe-ya.

6. I gēme kwa ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu ewe buru otù.

7. I gēme kwa ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka i gēme ha.

8. Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na iri, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu gēnwe.

9. I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n'ebe iru ulo-ikwū di.

10. I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua.

11. I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n'anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù.

12. Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 26