Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 31:18-37 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma umu-ntakiri nile n'etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu.

19. Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.

20. Ma uwe ọ bula, na ihe akpukpọ ọ bula, na ihe ọ bula eji aji ewu me, na ihe osisi ọ bula, unu gēwepu nmehie bayere ha n'aru-unu.

21. Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n'agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu:

22. otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,

23. bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.

24. Unu gāsu kwa uwe-unu n'ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.

25. Jehova we gwa Moses okwu, si,

26. Guta ọnu-ọgugu ihe-nweta, bú nke adọtara n'agha, ma n'etiti madu ma n'etiti anu-ulo, gi onwe-gi, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nke ndi bu nna nzukọ a:

27. kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile:

28. unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;

29. na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova

30. Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova.

31. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu.

32. Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n'ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n'agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri,

33. ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete;

34. inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-abua, na ọgu iri;

35. madu kwa, bú ndinyom ndi nāmaghi ndina nwoke, madu nile di orú nnù uzọ anọ.

36. Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:

37. útù atùru Jehova, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 31