15. Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu?
16. Le, ndia buru umu Israel, n'okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n'okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n'etiti nzukọ Jehova.
17. Ma ub͕u a b͕uenu nwoke ọ bula n'etiti umu-ntakiri, ọ bu kwa nwayi ọ bula nke mara nwoke site na ndina nwoke ka unu gēb͕u.
18. Ma umu-ntakiri nile n'etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu.
19. Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.
20. Ma uwe ọ bula, na ihe akpukpọ ọ bula, na ihe ọ bula eji aji ewu me, na ihe osisi ọ bula, unu gēwepu nmehie bayere ha n'aru-unu.
21. Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n'agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu:
22. otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,
23. bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.
24. Unu gāsu kwa uwe-unu n'ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
25. Jehova we gwa Moses okwu, si,
26. Guta ọnu-ọgugu ihe-nweta, bú nke adọtara n'agha, ma n'etiti madu ma n'etiti anu-ulo, gi onwe-gi, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nke ndi bu nna nzukọ a:
27. kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile: