Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 20:29-45 Bible Nso (IGBOB)

29. Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.

30. Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga.

31. Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel.

32. Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli.

33. Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba.

34. Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.

35. Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.

36. Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea.

37. Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile.

38. Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo.

39. Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu.

40. Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe.

41. Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru.

42. Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha.

43. Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu.

44. Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

45. Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 20