Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 14:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. O we rara manu-aṅu ahu n'ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n'ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu.

10. Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.

11. O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya.

12. Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:

13. ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya.

14. O we si ha,N'aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta,N'aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa.Ma ha apughi igosi ilu ahu n'ubọchi atọ.

15. O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?

16. Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n'anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m'nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m'gēgosi ya?

17. O we nākwasi ya ákwá n'ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n'ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n'ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu.

18. Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha,Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi,Unu agaghi-achọtawori ilum.

19. Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.

20. Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 14