Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 14:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya.

6. Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.

7. Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n'anya Samson.

8. Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, o we jeghachi ikuru ya, o we wezuga onwe-ya ihu ozu ọdum ahu: ma, le, ìgwè aṅu di n'ozu ọdum ahu, na manu-aṅu.

9. O we rara manu-aṅu ahu n'ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n'ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu.

10. Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.

11. O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya.

12. Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:

13. ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya.

14. O we si ha,N'aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta,N'aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa.Ma ha apughi igosi ilu ahu n'ubọchi atọ.

15. O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?

16. Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n'anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m'nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m'gēgosi ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 14