Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 1:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba:) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai.

11. O si n'ebe ahu jekuru ndi bi na Debia. (Ma aha Debia na mb͕e ara aga bu Kiriat-sefa.)

12. Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.

13. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.

14. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa we si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?

15. Ọ si ya, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb a ka i nyeworom, gi nyekwam isi miri ufọdu. Keleb we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.

16. Umu onye-Kinait, bú nna nwunye Moses, we si n'obodo nkwu soro umu Juda rigo n'ọzara Juda, nke di na Ndida nke Arad, ha we je biri n'etiti ndi ahu.

17. Juda we je, ya na Simeon, bú nwa-nne-ya, tib͕ue ndi Kenean ndi bi na Zefat, we wezuga ya ka ebibie ya. Ewe kpọ aha obodo ahu Họma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 1