Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 26:41-45 Bible Nso (IGBOB)

41. Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;

42. M'gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M'gēcheta; ala ahu ka M'gēcheta kwa.

43. Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.

44. Ma ọbuna n'ihe a kwa, mb͕e ha nọ n'ala ndi-iro-ha, M'gaghi-aju ha, M'gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha:

45. M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 26