M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.