Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 20:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua.

21. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa.

22. Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu ibi nime ya.

23. Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.

24. Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ.

25. Unu gākpa kwa ókè n'etiti anumanu di ọcha na nke ruru árú, na n'etiti anu-ufe ruru árú na nke di ọcha: unu ewe-kwa-la anumanu me onwe-unu ihe-árú, ewe-kwa-la anu-ufe, ewe-kwa-la ihe ọ bula nākpu akpu n'ala, nke M'kpaworo ókè n'etiti unu na ya, ime ka ọ rua árú.

26. Unu gābu-kwa-ram ndi nsọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, akpawokwam ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ ka unu we buru nkem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 20