Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:9-24 Bible Nso (IGBOB)

9. Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10. onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,

11. ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu.

12. Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;

13. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.

14. Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.

15. Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.

16. Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,

17. onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.

18. Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n'akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la.

19. ihe-otutó ọcha we di n'ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya;

20. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.

21. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa;

22. ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu.

23. Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha.

24. Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13