Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

6. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

7. Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:

8. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.

9. Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10. onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,

11. ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu.

12. Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;

13. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.

14. Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.

15. Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.

16. Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13