Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 6:15-27 Bible Nso (IGBOB)

15. O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa.

16. O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.

17. Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.

18. Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.

19. Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.

20. Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu.

21. Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.

22. Joshua we si ndikom abua ahu ndi nēledori ala ahu, Banu n'ulo nwayi ahu nākwa iko, menu ka nwanyi ahu na ihe nile o nwere puta, dika unu ṅuru ya iyi.

23. Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n'azu ọmuma-ulo-ikwū Israel.

24. Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.

25. Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.

26. Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.

27. Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n'ala ahu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 6