Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 1:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.

6. Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.

7. Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.

8. Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.

9. Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

10. Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si,

11. Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.

12. Joshua gwa-kwa-ra ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, okwu, si,

13. Chetanu okwu ahu nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, si, Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu zuru ike, Ọ gēnye kwa unu ala nka.

14. Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka;

15. rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n'ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu.

16. Ha we za Joshua, si, Ihe nile nke I nyeworo ayi n'iwu, ayi gēme ya, ebe ọ bula i gēziga ayi, ayi gēje ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 1