Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:36-43 Bible Nso (IGBOB)

36. Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:

37. si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:

38. ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke:

39. M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.

41. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.

42. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43. Agāzú kwa ọhia n'ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n'aka ndi Kaldea.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32