Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:30-42 Bible Nso (IGBOB)

30. N'ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n'anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n'ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

31. N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:

32. n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.

33. Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.

34. Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

35. Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.

36. Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:

37. si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:

38. ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke:

39. M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.

41. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.

42. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32