Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 10:5-17 Bible Nso (IGBOB)

5. Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.

6. Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n'idi-ike.

7. Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.

8. Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.

9. Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n'Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu.

10. Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.

11. Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.

12. Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:

13. mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

14. Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.

15. Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì.

16. Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

17. Chikọputa ihe-agha-gi n'ala, gi onye bi n'obodo anānọchigide n'agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 10