Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.