Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 17:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?

18. Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi!

19. Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.

20. Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.

21. Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M'gēme ka o guzosi ike n'ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru.

22. Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo.

23. Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka.

24. Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya.

25. Ishmael, bú nwa-ya nwoke, b͕a-kwa-ra arọ iri na atọ, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya.

26. N'otù ubọchi ahu ka ebiri Abraham na Ishmael nwa-ya nwoke úgwù.

27. Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n'ulo, na ndi eji ego b͕ata n'aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 17