Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 45:8-20 Bible Nso (IGBOB)

8. N'ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n'Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di.

9. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

10. Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe.

11. Ephah na bath gābu otù ọtùtù, ka bath we ruta otù uzọ n'uzọ iri nke homer, ka ephah we ruta kwa otù uzọ n'uzọ iri nke homer: dika homer si di, otú a ka ọtùtù-ya gādi.

12. Shekel gābu kwa orú gerah: orú shekel, orú shekel na ise, shekel iri na ise, ka maneh-unu gābu.

13. Nka bu àjà-nbuli nke unu gēbuli; otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka wheat, unu gēnye kwa otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka barley:

14. òkè manu, bú nke bath nke manu, gābu kwa otù uzọ n'uzọ iri nke bath sitere na cor, nka bu bath iri, ọbuná otù homer; n'ihi na bath iri bu otù homer:

15. na otù nwa-aturu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú nke sitere n'ọgu umu-aturu iri, site n'ebe-ita-nri nke Israel nke miri nēde nke-ọma; ibu onyinye-inata-iru-ọma, na ibu àjà-nsure-ọku, na ibu àjà-udo, ikpuchiri ha nmehie; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16. Ndi nile nke ala nka gādi n'àjà-nbuli a diri onye-isi n'Israel.

17. Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.

18. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.

19. Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.

20. Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 45