Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.