Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 45:16-25 Bible Nso (IGBOB)

16. Ndi nile nke ala nka gādi n'àjà-nbuli a diri onye-isi n'Israel.

17. Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.

18. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.

19. Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.

20. Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.

21. N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.

22. Onye-isi gēdozi kwa n'ubọchi ahu otù oke-ehi n'ọnọdu onwe-ya na n'ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie.

23. N'ubọchi asa nke ememe ahu ọ ganēdozi àjà-nsure-ọku ichuru Jehova, bú oke-ehi asa na ebulu asa nke zuru okè, kwa-ubọchi n'ubọchi asa ahu; na àjà-nmehie, bú otù nkpi, kwa-ubọchi.

24. Onyinye-inata-iru-ọma ka ọ gēdozi kwa, bú otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, otù hin nke manu di-kwa-ra otù ephah.

25. N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, n'ememe ahu, ka ọ ganēme dika ihe ndia si di n'ubọchi asa ya; dika àjà-nmehie, na dika àjà-nsure-ọku, na dika onyinye-inata-iru-ọma, na dika manu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 45