Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 41:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. O we me ka m'biarue ulo uku Chineke, o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya, cubit isi n'obosara n'otù akuku, na cubit isi n'obosara n'akuku nke-ọzọ, nka bu obosara ulo-ikwū ahu.

2. Obosara nke ọnu-uzọ di kwa cubit iri; akuku abua nke ọnu-uzọ ahu di kwa cubit ise n'otù akuku, na cubit ise n'akuku nke-ọzọ: O we tùa ogologo-ya, ọgu cubit abua, na obosara-ya, orú cubit.

3. O we ba nime, tùa akuku-ọnu-uzọ ọ bula nke ọnu-uzọ ahu, cubit abua: na ọnu-uzọ, cubit ise; na obosara ọnu-uzọ, cubit asa.

4. O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

5. O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n'otù n'otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.

6. Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.

7. Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti.

8. M'we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n'akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi.

9. Ib͕idi nke mb͕idi ahu, nke diri ulo ntà nke akuku, n'èzí, di cubit ise: ma nke fọduru bu ọnọdu nke ulo ntà nke akuku nke diri ulo ahu.

10. N'etiti ime-ulo abua ọ di orú cubit n'obosara buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 41