Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 40:38-47 Bible Nso (IGBOB)

38. Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n'akuku-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile; n'ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku.

39. Ọzọ, n'ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n'otù akuku, table abua di kwa n'akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n'elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma.

40. Ọzọ, n'otù akuku n'èzí, ebe madu nārigoru oghere nke ọnu-uzọ-ama n'akuku Ugwu, ka table abua di; ọ bu kwa n'akuku ọzọ, nke diri uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, ka table abua di.

41. Table anọ di n'otù akuku, table anọ di kwa n'akuku nke-ọzọ, n'akuku ọnu-uzọ-ama; ha di table asatọ nke ha nēb͕u ihe nchu-àjà n'elu ha.

42. Table anọ di-kwa-ra àjà-nsure-ọke, nke nkume awara awa, ogologo-ha di otù cubit na nkera, obosara-ha di kwa otù cubit na nkera, idi-elu-ha di kwa otù cubit: n'elu ha ka ha nādọba kwa ihe nile nke ha ji eb͕u anu àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ.

43. Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n'akuku nile: ọ bu kwa n'elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di.

44. Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu.

45. O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n'uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a.

46. Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi.

47. O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n'iru ulo ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 40