Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 38:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, n'ubọchi Gog nābia imegide ala Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na ọnumam gārigota n'imim.

19. Ọ bu kwa n'ekworom n'ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'kwuworo, si, N'ezie n'ubọchi ahu ime-nkpatu uku gādi n'elu ala Israel;

20. azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n'ala, na madu nile ndi nọ n'elu uwa, ewe me nkpatu site n'irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala.

21. M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.

22. Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 38