Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.