Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.

8. Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

9. Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

10. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?

11. Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33