Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche:

3. ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti;

4. mb͕e ahu onye nānu ihe nke nuworo olu opì-ike ahu, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya, ọ buru na mma-agha ahu abia wepu ya, ọbara-ya gādi n'isi-ya.

5. Olu opì-ike ahu ka ọ nuru, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya; ọbara-ya gādikwasi ya: ma onye ahu, asi na ọ nara idọ-aka-na-nti ahu, nkpuru-obi-ya ka ọ gēmewori ka o wepuga onwe-ya.

6. Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.

7. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.

8. Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

9. Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

10. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?

11. Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

12. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.

13. Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.

14. Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33