Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 95:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu,Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.

4. Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya:Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.

5. Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.

6. Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:

7. N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,

8. Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:

9. Mb͕e nna-unu-hà nwaram,Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.

10. Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi,M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu,Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 95