isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke,Nke miworo ara abua nke nnem!Mb͕e m'huru gi n'èzí, m'gēsutu gi ọnu;Ma ọ dighi onye gēledam anya.

2. M'gēduru gi, me ka i ba n'ulo nnem,I gēzím ihe;M'gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ,Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu.

3. Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim,Aka-nri-ya gāb͕akum.

4. Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi,Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta?Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

5. Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota,Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ?N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi:N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi,N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.

6. Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi:N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu;Ekworo siri ike dika ala-mọ:Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku,Ire-ọku nke Ja onwe-ya.

7. Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya,Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya:Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya,Agēleda ya anya nke-uku.

8. Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,Ma ọ dighi ara ọ kpuru:Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayiN'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?

9. Ọ buru na ọ bu mb͕idi,Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.

10. Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya:Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.

11. Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon;Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche;Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.

12. Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum:Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon,Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya.

13. Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige,Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi:Mem ka m'nuru ya.

14. B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ,Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke uda di iche iche.