isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya!Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma,Ọlu aka onye-ǹkà.

2. Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu,Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya:Afọ-gi di ka obo ọka wheatNke eji urodi b͕a ya buruburu.

3. Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abuaNke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.

4. Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;Imi-gi di ka ulo-elu LebanonNke chere Damaskọs iru.

5. Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel,Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo;Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.

6. Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku,Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile!

7. Ogologo-gi nka yiri nkwu,Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.

8. M'siri, M'gārigo elu nkwu,M'gējide igu-ya aka:Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine,Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;

9. Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma,Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ,Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.

10. Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ,N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.

11. Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia;Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.

12. Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile;Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru,Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko:N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.

13. Mandrake nile nēsì ísì utọ,Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie,Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.