isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 4 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma;Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi:Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.

2. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.

3. Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu,Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma:Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi.

4. Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di,Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri,Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.

5. Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru,Nke nāta nri n'etiti urodi.

6. Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,Mu onwem gēje n'ugwu myrrh,Na n'ugwu ntà frankincense.

7. I mazuru nma, eyìm;Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.

8. Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem,Si na Lebanon som:Site n'elu Amana le anya,Site n'elu Senia na Heamon,Site n'ebe-obibi nile nke ọdum.Site n'ugwu nile nke agu.

9. I riwo obim, nwa-nnem nwayi;I werewo otù nime anya-gi abua,I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.

10. Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem!Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine!Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!

11. Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem:Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi;Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.

12. Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu;Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.

13. Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia;Henna, ya na osisi manu nard nile,

14. Manu nard na saffron,Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense;Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.

15. Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu,Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu,Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.