Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 6:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza,I mara nma nke-uku dika Jerusalem,I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ.

5. Wepu anya-gi abua n'irum,N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu.Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.

6. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.

7. Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi.

8. Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa,Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.

9. Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè;Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu;Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu.Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma;E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.

10. Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu,Nke mara nma dika ọnwa,Nēnwu ka anyanwu,Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 6