Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 2:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion;O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo:O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo.

9. Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha:Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi;Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.

10. Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du;Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha:Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala.

11. Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku,Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim;N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.

12. Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di?Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n'amá nile nke obodo,Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n'obi ndi bu nne-ha.

13. Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem?Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke?N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?

14. Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu;Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata:Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.

15. Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi;Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si:Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?

16. Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi;Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya;N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 2