Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya!Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru!Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi,Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.

2. Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua;Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya:Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya,Ha aghọworo ya ndi-iro.

3. Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù;Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike:Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.

4. Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà;Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:

5. Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n'udo;N'ihi na Jehova emekpawo ya aru n'ihi iba-uba nke njehie-ya nile:Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n'agha n'iru onye-nkpab͕u.

6. Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua:Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.

7. Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nileIhe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie:Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 1