isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya!Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru!Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi,Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.

2. Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua;Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya:Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya,Ha aghọworo ya ndi-iro.

3. Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù;Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike:Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.

4. Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà;Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:

5. Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n'udo;N'ihi na Jehova emekpawo ya aru n'ihi iba-uba nke njehie-ya nile:Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n'agha n'iru onye-nkpab͕u.

6. Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua:Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.

7. Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nileIhe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie:Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.

8. Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.

9. Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.

10. Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya,Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.

11. Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.

12. Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ?Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

13. N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha:Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu;O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.

14. Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.

15. Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim:Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.

16. N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ;Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.

17. Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.

18. Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide:Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.

19. Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom,Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.

20. Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku:N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.

21. Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere;Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya:I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.